TỤFỊAKWA! GỌỌMENTI ỊKỌ AKỤKỌ INYE ỤMỤ AKWỤKWỌ NRI N’OGE MKPỌCHI OBODO ỌRỊA KORO BỤ OHI- NANS

Spread the love

Anyị amalite ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ 

Abiokuta – Otu National Association of Nigerian Students (NANS) akatọọla atụmatụ Gọọmenti Etiti Naịjiriya nwere nke ha ji akọ akụkọ ịmalitekwa inye ụmụ akwụkwọ nri n’oge Mkpọchi Obodo ọrịa koro dịka ohi nakwa iri ngarị.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Fraịdee, Onyeisi otu a na Naịjiriya bụ Danielson Akpan kwuru na ha ga- amalite ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụrụ na Gọọmenti Etiti agaa n’ihu n’atụmatụ nke ọ kọwara dịka ụzọ e si ezu ego.

 

This is as the Federal Government on Friday explained that it continued the National Home-Grown School Feeding Programme because it was practically impossible to get back the funds that had already been paid to food vendors before the lockdowns in states commenced.

Gọọmenti Etiti nọkwa ụbọchị Fraịdee were kọwaa na ọ gaghịkwa akwụsịnwu atụmatụ ahụ maka na a kwụchaalarịị ndị na – esi nri ahụ ụgwọ.
Akpan kwuru na “atụmatụ ahụ bụ nnukwu nzọhie ụkwụ nakwa usoro iji zunahu ndị Naịjiriya ego n’adịghị adị n’oge dị ugbua.

Akpan kwukwara na e kwesịrị inyocha ebe ego a mapụtara maka atụmatụ ahụ nke pụtara Ijeri Naira Iri n’atọ n’ọkara kwa ọnwa siri bịa.

O kwuru sị,” Ọgbakọ etiti NANS lebachara n’okwu banyere ebumnuche Gọọmenti Etiti ịmalitekwa atụmatụ inye ụmụ akwụkwọ nri ma kagbuo ya kpam kpam.

“Anyị katọrọ atụmatụ inye ụmụ akwụkwọ nri n’ụlọ. Nke ahụ bụ ụzọ esi eri ngarị.

“Gọọmenti Etiti gaa n’ihu n’atụmatụ a, anyị ga-amalite ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ na Naịjiriya nile. ”

Ọ kpọkuru Gọọmenti Etiti ka ha were ego ahụ were kwalite usoro agụmakwụkwọ na-akpụzị afọ n’ala n’ala anyị ma kwalitekwa iwulite ụlọ akwụkwọ dị iche iche.

Hmm, ihere a na-emekwa Gọọmenti a? Kedụ ka a ga-esi na-ekwu maka ịzọpụta Naịjiriya n’ụkọ ego sitere n’ọrịa koro ndị ọchịchị akaa obi kpachara anya na-ezu ego ọha? Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.