ỌRỊA KORO AGBAWO NDỊ AMỤMA ASỊ NA-ARỤ ỌRỤ EBUBE ADIGBOROJA N’ANWỤ- AACHBISHỌỌPỤ CHUKWUMA

Spread the love

Enugwu – Aachbishọọpụ Ịmanụel Olisa Chukwuma, Onyeisi ọzụzụ atụrụ ụka Angịlịkan na Mpaghara Enugwu ekwuola na Ọrịa Koro ekpugheela ọtụtụ ndị ụkọchukwu na Naịjiriya, ndị bụ ndị amụma asị nakwa ndị nkwado na-arụ ebube adigboroja.

Ụkọchukwu a okwu ya na – ada ụda kwuru nkea oge Raf Ede nke Akwụkwọ Akụkọ Punch gbara ya ajụjụ ọnụ n’Enugwu.

Chukwuma kwuru sị, “Ọrịa Koro bụ ọrịa ozurumbaụwa si Chaịna nke Chukwu jiri chọọ iji kuziere ụwa ihe dịka o siri mee n’oge nke Ụmụ Izrel maka na ụwa gbasara aghasa.

” Anyị na-enupuru Chukwu isi, na-eme mpako, tinyere ọtụtụ arụrụ ala ndị ọzọ. Ajọ ọchịchị, mmegbu nakwa enweghị ikpe Nkwụmọtọ jupụtara n’ụwa.

” Ndị a nile na-agagharị na-ebu amụma asị, na-arụkwa ọrụ ebube adigboroja, ọrịa koro ekpugheela ha dịka ndị okwu asị. Chukwu jikwa ya mee ka anyị mara na ọ ka mmadụ nile.

Aachbishọọpụ Chukwuma kwukwara sị, “Gịnị mere Legọs  Ogun nakwa Abụja, ebe e nwere ọtụtụ ndị sị na ha na agwọ ọrịa ji bụrụzịa ebe kacha nwee ọnụ Ọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa?

” Kedụ ihe mere na ndị a si na ha na-agwọ ọrịa anaghị aga n’Ogige Nkewapụ Ọrịa Koro ịga gwọọ ndị ọrịa?”

N’ezie, ọtụtụ ndị Naịjiriya tụrụ anya na Chineke ga-esi n’aka ndị amụma ya dịka Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministry  Enugwu, Ụkọchukwu Enọk Adeboye nke Ụka Redeemed ma ọ bụ Onye Amụma T. B. Joshuwa were gwọọ ndi ọrịa koro.

Kaosiladi, nke ahụ emebeghị maka na Chineke na-eme masịrị ya oge ọ masịrị ya. Nkea apụtara na ha abụghịkwa ndị amụma?

Leave a Reply

Your email address will not be published.