EJIMA KORO : NWANYỊ ỌRỊA KORO AMỤỌLA EJIMA NA LEGỌS

Spread the love

Legọs – Otu nwanyị dị iri afọ abụọ n’abụọ bụ onye Ọrịa Koro anọrọla n’ụlọ ọgwụ Lagos University Teaching Hospital (LUTH) , Idi Araba, Surulere were mụọ ejima nwoke na nwanyị.

Kọmishọna Legọs Steeti na-ahụ maka Ahụike, Ọkammụta Akin Abayomi, kwuru nke a ụbọchị Tuuzdee n’ozi o zipụrụ na Twitter.

Ọ kọwara na nwanyị ahụ bụ onye ọrịa koro nke anọ na – amụ nwa n’ụlọ ọgwụ ahụ.

“Taa, abalị iri n’itolu ọnwa Mee, ụlọ ọgwụ nwere onye ọrịa koro nke anọ na – amụ nwa ebe ahụ.

” Nke ikpeazụ a bụ ụmụ Ejima-nwoke na nwanyị dara 3.25kg nakwa 3.2kg na árọ́. Nne ha bụ onye a na-elekọta anya n’ebe ahụ maka Ọrịa Koro nakwa ime ọ dị.”

Abayomi kelekwara ndị dibịa oyibo, ndị nọọsụ nakwa ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ maka ichu uchu n’ọrụ ha.

Ọ rịọkwara ndị nile bi na Legọs n’agbanyeghị Steeti onye si, bụ ndị nwere ịrịbaama ọrịa koro ka ha bịa maka nnyocha ahụ.

Hmm, Chukwu arụka

Leave a Reply

Your email address will not be published.