E JIDELA NDỊ ỌGWỤ EGO MMADỤ ATỌ KA NDỊ MGBERE ANỤ MMADỤ TICHARA HA GWOO GWOO MAKA AKWỤGHỊ ỤGWỌ AKA MMADỤ E RESIRI HA

Spread the love

Abiokuta – Ndị mgbere anụ mmadụ ji iwe were tie ndị ahịa ha gwoo gwoo maka na h a akwụghị ha otu Nde Naịra ha kpebiri maka iresị ha aka mmadụ.

Ha ratara ndị ahịa ha ahụ n’ime ọhịa were tie ha étí étí maka ịjụ ịkwụ ụgwọ “ngwa ahịa” e bunyere ha.

Mmadụ atọ ahụ chọrọ iji ahụ mmadụ gwọrọ ọgwụ ego bụ  as Matiu Idosu, Jọn Feyisetan na Samụwel Adegbola.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii n’Ogun Steeti, Abimbola Oyeyemi, kwuru na ndị Uwe Ojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ, So-safe Corps, jikọtara aka were jide ndị ọgwụ ego mmadụ atọ ahụ tinyere onye dibịa, Michael Itomu.

Oyeyemi kwuru na e jidere mmadụ anọ a n’Idi-Iroko, ka ha ji aka mmadụ, ha ji eme ọgwụ ego.

Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.