NỌỌSỤ “ỌKỤ ELU” GBA ỌTỌ BỊA ILETA NDỊ ỌRỊA KORO

Spread the love

Rọshịya – Ótú onye nọọsụ “ọkụ elu” na Tula, mba Rọshịya ka ndị nlekọta Ụlọ ọgwụ Nlekọta Ọrịa Koro kwụsịrị ọrụ maka ịgba   ọtọ bịa ileta ụmụ nwoke ndị ọrịa koro.

Ya bụ nwa agagbọghọ nọọsụ yi uwe nchekwa wụdara n’ala na-enyo enyo (vinyl) nke na-egosi na sọọsọ ihe o yi n’ime bụ uwe ara nakwa ị́bá.

Nọọsụ ahụ gwara ndị nlekọta ụlọ ọgwụ ahụ dị na Tula, nke dị ótù narị maịlị na Ndịda  Mọsko, na ihe o ji gbara ọtọ bụ na “ahụ na-ekpo ya ọkụ”

Kaosiladi, ndị ọrịa ahụ enyeghi mkpesa ọbụla maka ekike ya mana ndị nlekọta ụlọ ọgwụ ahụ nyere ya ntaramahụhụ maka “ekeghi ekike etu kwesịrị ekwesị dịka onye ọrụ ahụike”.

Nọọsụ ahụ na-ekwu na ya amaghị na ya gba ọtọ. Ndị obodo ahụ n’aka nke ọzọ ahụtaghị ihe ọjọọ ọbụla n’okwu ahụ.

Lee ihe ndị mmadụ kwugasịrị maka okwu a n’akwụkwọ akụkọ mba ahụ bụ Tula Pressa.

“Ka enwekwaanụ onye na-eme ka ihu tọọ ndị mmadụ ọchị n’oge mgbarụ ihu a” Sergey Ratnikov.

Marina Astakhova kwuru, “Ya jisike, o mere ndị ọrịa ahụ obi ụtọ ”

Valery Kapnin jụzịrị sị, “Gịnị mere e ji nye nọọsụ ahụ ntaramahụhụ? E kwesịrị ịgba ya ume. Nwoke ọbụla kirichara ya agaghị achọkwa ịnwụ”

Ọrịa koro egbuola ihe dịka mmadụ puku atọ na mba Rọshịya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.