ÒTÙ SECOR, ENUGWU AMALITEWO IKESA MKPUCHI IHU N’EFU

Spread the love

Enugwu –  Òtù South East COVID-19 Report, ngalaba Enugwu Steeti nọrọ ụbọchị Mọnde, abalị iri n’asatọ nke ọnwa Mee, afọ 2020 were malite atụmatụ ikesara ọhaneze mkpuchi ihu maka ọrịa koro n’efu.

Ndị otu a malitere n’ahịa Arịa (New Market), ebe ha gagharịrị na-èkè ndị mmadụ mkpuchi ihu n’efu ma na-enyekwa nkuzi banyere nchekwa maka ọrịa koro.

South East COVID-19 Report bụ ọgbakọ,  jikọtara òtù ndị kwụụrụ onwe ha, ndị nnọchiteanya Steeti nile nọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda òtù nkwalite mmepe mba ụwa (International Donor Agencies) nke ebumnuche ya bụ ijikọ aka were kwalite atụmatụ ịchụla ọrịa koro na mpaghara ahụ.

Ndị òtù ahụ sikwa ebe ahụ gaa ahịa Ogbete. N’ebe ọbụla ha rutere, ha na-akọwara ndị mmadụ mkpa ọ dị bụ iji ncha kwọọ aka kwa mgbe kwa mgbe. Ha na-egosikwa ụzọ ziri ezi iji kwọọ aka maka igbochi ọrịa koro.

Ụfọdụ ndị soro gaa njem ahụ gụnyere Mazị Ikechukwu Bismarck Ọjị, MNSE, Onyeisi òtù SECOR, ngalaba Enugwu Steeti bụrụkwa  Nlekọta òtù Centre for the Advancement of Literacy and Leadership (CALL), Chika Mbah nke Peter Mbah Foundation, Oriakụ Onyi Mamah, Mazị Dan Ụkwụ (Dan Ụkwụ Foundation), Oriakụ Amaka Igwe(Global Society Against Corruption), Mazi Ogene Ogbodo (Towncrier Initiative), Nene Florence (IGWE Africa).

Ndị ọzọ gụnyere Mazị Raf Ede (Onye nta akụkọ n’akwụkwọ akụkọ Punch), Mazi Ferdinand (Hope Givers Initiative), wdg.

Echi ya bụ ụbọchị Tuuzdee, ndị òtù gakwara n’ahịa Mayor ya na Afọ Ọkụnanọ (Gariki) ebe ha mekwara ótù ihe ahụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwupụtara obi ụtọ ha maka ya bụ mbọ nke òtù ahụ na-agba ịchụla ọrịa koro n’Enugwu Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published.