ỤKỌCHUKWU NDỊ AKPỤ OBI ONYEISI OCHE N’EBONYỊ TIRI IHE GBAKWAA MMIRI “GUTTER” NWERE IKE IDAZỊ NGWỤRỌ

Abakaliki –  Ụkọchukwu Okochi Obeni nke Ụlọ ụka God’s Descendants Assembly, Amasiri, dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo, onye ndị akpụ obi tiri gwoo gwoo ma gbakwaa ya mmiri si n’ọwa mmiri (gutter) ekwuola na ndị Dọkịnta na-ekwu na o nwere ike ịdazị ngwụrọ, ma a kpaghịrị anya.

Obeni, onye bụkwa onye na-ekwu maka ọdịmma obodo n’ọba ozi mmekọrịta nọzị n’ụlọ ọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital, Abakaliki, ebe ọ na-agbake na mwakpo nke ndị akpụ obi nke Ogbonnaya Oko Enyim, Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo dinyere.

O kwuru na esemokwu ya na Onyeisi Oche okpuru ọchịchị ahụ bụ sọọsọ maka na ya na-akatọ ajọ ọchịchị.

“Okwu mụ na ya malitere oge m katọrọ ọchịchị ya na o nweghị ike ịrụnwu ótù kilomita okporo ụzọ dịka ndị isi oche okpuru ọchịchị ndị ọzọ.

” Ugbua, ndị Dọkịnta na-ekwu na o nwere ike agaghịkwa m aganwu ije ọzọ.”

Ọ kọwara na ọ bụ n’abalị iri n’anọ nke ọnwa Mee, afọ 2020 ka ndị akpụ obi ahụ wakporo ya nyekwa ya mmekpa ahụ dị egwu.

“Ha kepuru m aka n’azụ were ụtarị pịawachaa m ahụ. Ha gbakwara m mmiri si n’ọwa mmiri.

Bikonu, ọ gịnị na-afịọ n’Ebọnyị Steeti?

 

1 Comment

  1. Ihe nke a dịkwa egwu o

Leave a Reply

Your email address will not be published.