NGIGE KERE SỌỌSỌ NDỊ OBODO YA NGWA NBELATA NHỊAMAHỤ ỌRỊA KORO

Ọka – Sinetọ Dọkịnta Kris Nwabụeze Ngige, Mịnịsta Naịjiriya na-ahụ maka Ọrụ nọrọ na nso a were nye ndị obodo ya bụ Alọ, n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti ngwa nbelata nhịamahụ ọrịa koro.

Ngige mere nkea site n’ótù Sen. Chris Nwabueze Ngige Foundation, Alor London.

Ihe o kere gụnyere Nde Naira Ise maka ezinụlọ otu puku, tinyere ígbè Indomie otu Puku, ígbè ekpem mmiri otu puku, akpa osikapa na nsacha aka (sanitizers).

Kaosiladi, nke a butere ntamu maka na e were na Ngige etofeela ime ihe “ndị Alọ”.

Dịka onye chịrị Anambara Steeti nile ka Gọvanọ, a tụrụ anya na ihe ọbụla ọ ga-eke ga erute mmadụ nile maka na ọ bụ Onyeisi (PG), Ọgbakọ ndị Alọ.

Ndị mmadụ rụtụrụ aka na etu Pita Obi siri hụ na ihe nbelata nhịamahụ o kere rutere akụkụ Anambara Steeti nile. Nke ahụ egbochighi ya imere ndị be ha  ndị Agụlụ ihe pụrụ iche.

N’aka nke ọzọ, dịka Sinetọ nọchiteburu anya Mpaghara Etiti Anambara, Ngige ka nwere ike kee ndị mpaghara ahụ nile ihe nbelata nhịamahụ.

N’ihi nkea, Sinetọ Kris Nwabụeze Ngige kwupụtara na nke o mere n’Alọ bụ mbido, na ọ ka ga-eme otu ihe ahụ n’Okpuru Ọchịchị ya tupu o mezie nke mpaghara Etiti Anambara nile.

Biko, Ọnwa! Jisike!!

Leave a Reply

Your email address will not be published.