LEE BRUNO ỌPARA, ONYE UWE OJII NA-AGBAZỊ ỤMỤ ÁSÁ ARA

Ezigbo ọgụ na-ada n’etiti ụmụ ásá nile nọ n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche na Naịjiriya ugbua. Ma Facebook, ma Twitter ma Instagram.

Ọ bụ BRUNO Chigọzie Ọpara kpatara ya. Kemgbe ya bụ nwa-afọ Imo Steeti, onye mara mma ma nwekwaa akpụ obi dịka C. Ronaldo tinyere onyonyoo ya n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche, ụmụ ásá na-achụsozi ya ka ijiji.

Cherekwa, e chekwa m na ọ bụ ndị yiri Oshiomole ma ọ bụ Ọbasanjọ ka a na-ewe n’ọrụ Uwe Ojii.

Ụfọdụ ụmụ agbọghọ, tinyere ndị nne nwanyị, ndị agadi ekwe nka na – achọ ihe ọbụla ha ga-eme iji rata ya bụ odogwu.

Na Facebook, otu nwa agbọghọ tiri, “Aah! Nnaa, ihe gị atọgbuo m!”

Na Twitter, otu nwa agbọghọ tiri mkpu sị  “Bruno! Bịa kpụrụ m kpọchie, a daala m iwu”

Ka m jụkwaa ajụjụ nzuzu, “Kedụ ihe mere Bruno ji hapụ Nollywood bịa baa Uwe Ojii?”

Leave a Reply

Your email address will not be published.