“ỊJỌ SỊ NA HA KWỤỤRỤ ONWE HA, NA HA ABỤGHỊ BỊAFRA, HA BUSO NAỊJIRIYA AGHA KA ANYỊ HỤ” – BNYL

Kalaba – Osote Onyeisi òtù Biafran National Youth League (BNYL), Ebuta Takon Akor echeerela ndị Ndintorọbịa ndị Ịjọ, Ijaw Youth Council (IYC) akamgba ma gwa ha ka ha gaa luso Naịjiriya agha, iji gosi na ha nwere ike ikwudo sọọsọ ha na Mpaghara Naịja Delta.

Akor kwuru nke a maka okwu ọnụ na-ekwuru òtù IYC kwuru, na-asị na ndị Ịjọ esoghị Ndigbo eme Bịafra, na ha kwụụrụ onwe ha.

O kwuru nkea maka ahụhụ Ndigbo na ndị Biafra ndị ọzọ gabigara n’agha Biafra.

Chetakwa na Mazi Dan Dasimaka, Ọnụ na-ekwuru ndị IYC, ndị nke kwenyere n’ọchịchị nọrọ na nso a were sị Ndigbo ha gụpụ ha na Biafra maka na ndị Ịjọ kwụụrụ onwe ha.

Akor kwukwara sị, “Ụfọdụ ndị, ọ kacha ndị Ịjọ na-ekwu na Biafra bụ sọọsọ maka Ndigbo.

“Nke a bụ asị. Agha Bịafra metụtara ndị nile bụ ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, o metụtara ndị Bakassi karịa ndị ọzọ nile”

N’agbanyeghị nkọgheri ndị IYC ụfọdụ ndị Ịjọ na-ewu ewu dịka Asarị Dọkụbọ kwenyesiri ike na Bịafra.

Ọ bụkwa onye Ịjọ, Ichie Frank Opigo bụ onye bara Biafra aha. Gọọmenti Etiti jikwa maka nkwenye o nwere na Bịafra were napụ ya nnukwu obosara ala ya ebe e jizi mere ụlọ akwụkwọ Niger Grammar School, Rumuola na Pọt Haakọt (Ìgwè Ọcha).

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.