ARA: “INSPECTOR” AGBAGBUOLA ONYE UWE OJII IBE YA

Legọs – Inspector Monday Gabriel, nọrọ Sọnde gbagbuo onye òtù ya, Sargeant Felix Okago, n’Ikoyi, Legọs Steeti.

Ozi hoo!haa!!nwetara na-ekwu na ndị Uwe Ojii ahụ nọ ọrụ nche n’ótú ụlọ ọrụ Gọọmenti Etiti dị n’Ikoyi tupu jiri bịa Inspector ahụ n’ísí nke mere ka ọ gbawa egbe aghara aghara wee gbagbuo nwamadị ahụ.

Bala Elkana, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti kwuru na ndị Uwe Ojii jidere Gabriel n’ebe Akọma, ka ọ na-achọ ịgbalaga.

O kwuru na a kpọgawo Gabriel, onye nke na-eme ka onye isi adịghị mma ụlọ ọgwụ iji nyochaa isi ya ọfụma.

Elkana kwuru sị , “N’ụbọchị ụka, abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Mee, n’ebe elekere anọ n’ọkara, e nwetara ozi na ótú Inspector Monday Gabriel nke. No 21 Police Mobile Force Squadron, Abuja, ka ọ nọ ọrụ n’ụlọ ọrụ Gọọmenti Etiti n’Ikoyi Legọs malitere yịwa ara ma gbawa egbe aghara aghara.

“Ọ gbagburu ótú Sargeant Felix Okago, onye òtù ya, ebe ndị òtù ha ndị ọzọ gbalagara.

“Ndị Uwe Ojii jideziri ya n’ebe Akoka, ka o bu ụgbọala ọrụ ndị Uwe Ojii gbara egbe aghara aghara na-etinye isi n’ụzọ àkwà mmiri Third Mainland iji gbalaga”

Hmm, ọ dịkwa mma na ndị Uwe Ojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gana aga ụlọ ọgwụ ndị ísí mgbaka kwa mgbe kwa mgbe, iji nyochaa ísí ha ọfụma.

Leave a Reply

Your email address will not be published.