MAJEK FASHEK ANWỤỌLA N’ỌRỊA CANCER

Legọs – Ọnwụ egbuola Majekodunmi Fasheke, onye a maara dịka Majek Fashek, ochie dike egwu Reggae na Naịjiriya.

Majek na Cancer bụ ihe mechara taa isi ya gbara mgba afọ ole m’ole tupu ọ nwụọ ụnyahụ na Nu Yọk.

Onye Nlekọta ya, Omenka Uzoma, tinyere ozi ahụ n’ọba ozi mmekọrịta Instagram odogwu a, onye gbara afọ iri ise n’asaa tupu laa mmụọ.

“Taa, ọtụtụ a kpọọla n’ekwentị. Ochie Dike, odogwu mbụ na mba Afrịka, alakwuruwo onye kere ya”

“Ka ka anyị kwupụta ihe o mepụtara n’ụwa, ihe ezinụlọ kpebisiri, e mee ka unu mara.”

Majek Fashek, onye a mụrụ na Bini, Edo Steeti tipụtara ọtụtụ egwu Reggae wuru ewu, ọ kacha “Send down the Rain” nke o tiri n’afọ 1988.

Ya na ọtụtụ ndị ótí egwu a maara ama na mba ụwa etikọọla egwu dịka Tracy Chapman, Jimmy Cliff, Michael Jackson, Snoop Dogg na Beyoncé.

Ekele dịrị Femi Otedola nakwa ụmụ afọ Naịjiriya ndị ọzọ ndị gbatara Majek ọsọ enyemaka kemgbe ọ na-alụ ọgụ isepụ aka ná ịṅụ ígbó nakwa ọgwụ ike ndị ọzọ ndị mekpara ahụ

Bikonu, iwu abụ na mmadụ agaghị agụtanwu ọnụ ya n’egwu n’aṅụghị ígbó?

Leave a Reply

Your email address will not be published.