TỤFỊAKWA! E JIDELA ỤMỤ NWOKE IRI N’ÓTÚ DINARA NWATAKỊRỊ DỊ AFỌ IRI N’ABỤỌ N’IKE

Dutse –  Ndị Uwe Ojii na Jigawa Steeti ejidela ụmụ nwoke iri n’otu ndị a na-ebo ebubo idina nwatakịrị nwanyị dị afọ iri n’abụọ n’ike.

Ndị okenye arụrụ ala ndị a, site n’ozi hoo!haa!! nwetara dinara ya n’ụbọchị dị iche iche. Ikekwa, onye gaa pụta, ọ kọọrọ ibe ya.

Aka kpaara ha oge e jidere ótú n’ime ha ka ọ ratara nwatakịrị nwanyị ahụ n’ime ahịa Limawa dị na Dutse, ka o were dinakwaa ya ọzọ.

Ka ndị Uwe Ojii gbara ya ajụjụ ọnụ, nwatakịrị nwanyị ahụ kpọrọ aha ụmụ nwoke, ndị okenye arụrụ ala ndi ọzọ.

Abdu Jinjiri, ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Jigawa Steeti kwuru na ndị uwe ojii nwụchikọrọ ụmụ nwoke ahụ ụbọchị Satọdee, oge ha nwetara mkpesa na ótú n’ime ha chọrọ idina nwatakịrị nwanyị ahụ n’ike.

“Ndị Uwe Ojii na-eme nnyocha maka ebubo idina nwanyị n’ike maka ótú nwoke dị iri afọ ise n’asaa, onye e jidere n’ime ahịa Limawa dị na Dutse, ka ọ na-achọ idina ótú nwatakịrị nwanyị dị afọ iri n’abụọ n’ike.

“Ka agbara ya ajụjụ ọnụ, onye a ọdachi dakwasịrị kpọrọ aha ụmụ nwoke iri n’otu, ndị dinaworo ya n’oge dị iche iche, ndị Uwe Ojii ejidela ha nile, nnyocha na-agakwa n’ihu ugbua tupu a kpụga ha ụlọikpe”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.