ONYE ỌRỊA EJIRILA SỊGA SEGBUO ONWE KA SỊGA YA SUNYERE ỤLỌ ỌGWỤ ỌKỤ

Ọkụ ọgbụgba dapụtara n’ótú ụlọ ọgwụ dị n’obodo St. Petersburg na mba Rọshịya ụbọchị Wenezdee agbagbuola ótú onye ọrịa, onye, butere ọkụ ahụ site na idina n’àkwà ya na-ese sịga.

Site n’ozi si n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi mba Rọshịya bụ TASS, nwoke ahụ bụ onye a na-agwọ maka ọrịa eriri afọ n’ụlọ ọgwụ Botkin “Infectious Disease Hospital”.

Ihe gburu nwamadị ahụ bụ anwụrụ ọkụ o kuuru site n’ọkụ ọgbụgba ahụ.

Ndị ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ mechara tinyụọ ọkụ ahụ. O nweghịkwa ndị ọzọ nwụrụ n’ime ndị ọrịa mmadụ narị abụọ n’iri asaa n’anọ nọ n’ebe ahụ.

Hmm, kedu ka mmadụ ga-esi jiri sịga segbuo onwe ya? Nsogbu dịkwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.