“FULANI, KWAPỤNỤ N’ỌHỊA NILE DỊ N’ALA-IGBO UGBUA!” – IGBOAYAKA

– Anyị atụkwasaghịkwa ndị Gọvanọ Ala-Igbo obi – Igboayaka 

Owere – Òtù Ohaneze Youth Council (OYC) enyela ndị Fulani ntimiwu ka ha si n’ọhịa nile nọ n’Ala-Igbo kwapụ ozigbo.

Nkea bụ isiokwu sitere n’ọgbakọ pụrụ iche ndị òtù a nwere n’Owere, Imo Steeti ụbọchị Tọọzdee banyere ọnọdụ nchekwa Ala-Igbo.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, ka ọgbakọ ahụ gbasara, Nnukwu Onyeisi òtù a, Comrade Igboayaka O. Igboayaka kwuru sị,

“Anyị na-adọ ndị ndị nchị ehi ndị Fulani aka na ntị ka ha si n’ọhịa nile dị n’Ala-Igbo pụọ n’udo ugbua.

” Iji mee ka udo di n’enweghị egwu mwakpo ndị Fulani na-achị ehi n’ugbo dịgasị n’Ala-Igbo, OYC na-akpọku ụlọ nzukọ Omebeiwu dịgasị na Steeti dị n’Ala-Igbo ka ha mebe iwu machibidoro ịchịgharị ehi ozigbo”

OYC rụtụkwara aka na n’ọchịchị Muhammadu Buhari, na ndị ọrụ nchekwa obodo dịka ndị soja na ndị Uwe Ojii tinyere ndị ekperime ndị Fulani na ndị Boko Haram aka na imemina ụmụ amaala Naịjiriya.

Igboayaka gakwara n’ihu gwa Ndigbo ka ha kee nkwụcha maka mwakpo ndị Fulani, ebe nchọpụta si n’aka òtù International Society For Civil Liberties & Rule of Law (Intersociety) na-egosi na ndị Fulani ejichiela ihe karịrị obodo narị anọ n’Ala-Igbo.

OYC kwukwara hoo!haa! na ha atụkwasaghị ndị Gọvanọ Ndigbo obi ma rịọkwaa òtù  Association of South-East Town Unions (ASETU) nakwa ndị Isi ọgbakọ obodo nile dị n’Ala-Igbo ka ha malite ịchịkọba ndị nche ógbè

Leave a Reply

Your email address will not be published.