LEKWA ODUMEJE LEE NGA!

Ọka – N’agbanyeghị mgbaghara nile ọ rịọrọ, aka ndị Uwe Ojii akparala Onye amụma Chukwuemeka Ọhanyere “Odumeje”.

Ụbọchị Tuuzdee, Odumeje nọtere aka n’isi ụlọ ọrụ Ndị Uwe Ojii n’Anambara Steeti n’Ọka.

“Liquid Metal” bịara ịzara ọnụ ya maka ebubo okwu na-akpalite ọgbaghara, okwu na-emebi ihe, okwu akpọmasi, Mkparị na nkwutọ aha, wdg.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ọ jụrụ ịza oku ndị Uwe Ojii, n’agbanyeghị na ha zitere ya ozi ugboro ugboro ka ọ bịa zara ọnụ ya.

Cheta na Odumeje dabara na nsogbu maka ihe ọnụ ya kwutere ya. Ọ nọrọ n’onyonyoo dị iche iche were kwuo na ya ga-emechi mmemme Ikeji ndị Arọndizuọgụ ma mebikwaa mmemme Imo Ọka.

N’ezie, “The Lion himself” arịọwo mgbaghara n’aka ndị Ọka, ndị Arọndizuọgụ, ọ kacha ezinụlọ Perikome, onye nke o kwutọrọ.

Ugbua, nsogbu Odumeje gbazịrị mkpị. Ọ na-eche maka okwu ya na ndị Uwe Ojii nakwa ije nga n’otu aka. N’aka nke ọzọ, ọ gana echekwa maka arụsị ụmụ Perikome na ndị dibịa Ọka tụrụ ya.

Ndị dibịa Ụmụ Pericome nọrọ n’onyonyoo gbajisie ọkụkọ ụkwụ, ma kwuo na ọ bụ otu  ahụ ka ọ ga-esi adịrị Odumeje, site na udiri ọnwụ ọ ga-anwụ.

Ndi dibịa Ọka nyekwara Odumeje izu ụka ole fọrọ tupu “ọkịrị mgbawa isi” ha zigaara ya erute ya aka, ọ gbara ọtọ kpagharịwa, tụtụwa kom kom.

Egwu dịkwa! Bikonu, ndị Ọka na ndị Arọndizuọgụ, ọ kacha ụmụ Pericome, gbagharanu Odumeje. Ọ kwa egwu ka ọ na-egwu

Leave a Reply

Your email address will not be published.