A KPỤPỤWO ONYE A SỊ KWUTỌRỌ GỌVANỌ ỤZỌDỊMMA NA FACEBOOK ỤLỌIKPE MAKA IYI ỌHA EGWU

Owere – Ndị ụlọ ọrụ nchekwa DSS akpụpụla Mazi Ambrose Nwaogwugwu, Onye Nlekọta ngalaba Mgbasa ozi ọbaozi nke ótù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP ụlọikpe majie n’Owere maka iyi ọha egwu (terrorism) na nkwutọ aha maka edemede ya n’ọba ozi Facebook megide Gọvanọ Hope Ụzọdịmma nke Imo Steeti.

N’akwụkwọ nwelite ikpe nke akara ya bụ  0W/217c/2020, nke e jiri welite okwu ahụ n’ụlọikpe, e boro nwamadị ahụ dị iri afọ abụọ n’itolu ebubo na o kwuru na Gọvanọ Ụzọdịmma ewepụtala obosara ala na Ngor-Okpala dịka ogige Ruga maka ndị Fulani na-achị ehi, na ọ chọrọ ịbagharị Mahadum Imo Steeti aha dịka Mahadum Abba Kyarị, onye jibu ọkwa dịka Onowu Onyeisiala Buhari tupu ọ laa mmụọ. Ọ zọkwa bụ na ọ sịrị na Ụzọdịmma chọrọ iri akatamkpo ego dị ijeri Naira Ise n’ụma abụọ bụ maka ịkwụ ndị laworo ezumike ụgwọ.

Gọvanọ Ụzọdịmma agọọla ụkwụ n’aka ya na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu.

Hmm, nke bụ eziokwu bụ na anyị nọ n’ọchịchị onye kwuo uche ya mana tupu i dee ihe ọbụla banyere mmadụ,  ọ kacha ndị nọ n’ọkwa ọchịchị, nyochaa ya nke ọma mara ma ọ bụ eziokwu.

Leenụ ugbua, ọmalincha nwokorọbịa nọ na nga ugbua, kedu ihe ndị PDP ga-eme iji gbapụta ya?

Leave a Reply

Your email address will not be published.