AKA AKPARALA NWOKORỌBỊA SUSURU NWA DỊ AFỌ ATỌ ỌNỤ

Legọs – Aka ndị Uwe Ojii nọ na Legọs Steeti akparala Babatunde Adeyeye, nwata akwụkwọ na Mahadum Legọs Steeti, onye mebere onyonyoo wusara ebe nile, ebe ọ na-esusu nwatakịrị nwanyị dị afọ atọ ọnụ.

Ndị Uwe Ojii jidere ya bụ ekperime n’ụlọ ya dị n’Okporo Ụzọ Kajola na Shagamu, Ogun Steeti, ka ọ gachara abalị atọ o zisara ya bụ onyonyoo.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Legọs Steeti, DSP Bala Elkana, kwuru na Kọmishọna ndị Uwe na Steeti ahụ, Hakeem Odumosu, nyere ndị ngalaba nnyocha ntimiwu ka ha maa imi n’ala chọta Adeyeye ka ha kirichara onyonyoo ahụ.

Kọmishọna ndị Uwe Ojii ahụ rịọrọ ọhaneze ka ha na-ekwuguide idina nwanyị n’ike, imetọ ụmụaka nakwa mpụ ọbụla megidere ụmụ nwanyị.

Kaosiladi, Adeyeye na – akọwa na o nweghị ajọ ihe ya bu n’obi oge ọ na-esusu nwanne ya nwanyị ahụ ọnụ.

Ọ rịọrọ ka a gbaghara ya na ihe ahụ o mere n’amaghị ama wutere ya.

Hmm, kedu udiri egwu nzuzu bụ nkea? Ekperime a, a na-agwa anyị na anyị amaghịkwa ihe dị iche n’égbé na égbè.

Kedu nke bụ isusu nwanne gị, nwatakịrị dị sọọsọ afọ atọ ọnụ, buru ọnụ kwụnye ya n’ọnụ ebe o nweghị ihe ọjọọ i bu n’obi?

Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.