AKỤKỌ ỤWA

2023: JONATAN ENWETAWO IKIKE ỤLỌIKPE ỊZỌ ỌKWA ONYEISIALA

Yenagoa: Dọkịnta Gudlọk Jonatan, Onye bụbu Onyeisiala Naịjiriya enwetawo ikike n’aka ụlọikpe Etiti na Yenagoa, Bayelsa Steeti ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Ọka ikpe Isa Hamma Dashen nọrọ taa bụ Fraịdee were nye mkpebi na Jonatan nwere ikike ịzọ ọkwa Onyeisiala maka na iwuala Naịjiriya anaghị adị ìrè lọghachi azụ.

Nkea bụ maka na iwu ahụ Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere aka n’afọ 2017, nke machibidoro onye e duworo n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala ugboro abụọ enweghịkwa ikike ịzọ ọkwa Onyeisiala ọzọ, emetụtaghị ya.

Ọka ikpe Dashen kọwara na nke a bụ n’ihi na Jonatan arịtuwo n’ọkwa dịka Onyeisiala tupu iwu ahụ malite dịwa ire.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close