NKE NA-EME UGBUA

A DỊ M NJIKERE ỊNARAKWA NNAMDI KANỤ N’AKAEBE ỤLỌIKPE ỌZỌ – ABARIBE

Onye ndu ndị a ka n’ọnụ ọgụgụ na Sinetọ Naịjiriya, Sinetọ Enyinaya Abaribe, nọrọ ụbọchị Wenzdee na mmemme TVC bụ “Journalists Hangout” were kwuo hoo!haa! na ya dịkwa njikere ịnara kwa Mazi Nnamdi Kanụ, Onyeisi òtù IPOB n’akaebe ụlọikpe, ma ohere ahụ dapụtakwa ozo.

Abaribe kwuru na ya mere Kanụ ihe ya nwere ike imere ya dịka onye Igbo ibe ya nakwa onye Abịa Steeti ibe ya, tinyekwara na ọ bụ ya onwe ya bụ Onyeisi Oche Ọgbakọ ndị Sinetọ si Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, oge ahụ.

Ọ kọwara na nke bụ maka ihi na ụlọikpe nyere ntụziaka na ótù onye n’ime ndị ga-anara ya Nnamdi Kanụ n’akaebe ga-abụ Sinetọ.

Sinetọ ahụ sịrị: “Ọ bụ nwa anyị nwoke. Ọ bụ onye steeti anyị (Abịa). O ji ọnụ ya kwuo na ihe ọ gbara bụ ọsọ ndụ.

“O nwere ọdịiche n’etiti onye a natara n’akaebe ụlọikpe ịgbafu agbafu na mmadụ ịgba ọsọ ndụ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close