A GA-ARỤ ÓGWÈ ỌGBANELU NKE MBỤ YA N’IME ENUGWU


Enugwu: Gọọmentị Enugwu Steeti ga-arụ ógwè ọgbanelu na Njekọrịta Ụzọ T junction e si aga ụlọ nkwari akụ Nike Lake n’afọ ọzọ iji belata oke mkpọchi ụzọ na-adị ebe ahụ.
Nkea so na ihe ndị dị n’Usoro Mmefu Ego nke afọ 2020 Aka na-achị Steeti ahụ, Rt. Hon. Ifeanyi Ugwuanyi chere n’ihu Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti taa bụ abalị itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2020.
Mkpokọta Ego dị n’Usoro Mmefu Ego a pụtara Ótù Narị Ijeri Naira na Iri Isii n’itolu, Nde Narị asatọ n’iri anọ n’ise, Narị asaa na iri ise n’asatọ na narị atọ (N169, 845, 758, 300).
Gọvanọ Ugwuanyi rịọrọ nkwado ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti iji hụ na Usoro Mmefu Ego ahụ nke o sịrị ga-eweta agamnihu na Steeti ahụ gafere ọsịsọ.
Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Steeti ahụ, Rt Hon Edwọọdụ Ụbọsị kwere nkwa na ha ga-enye Gọvanọ Ugwuanyi nkwado zuru oke na ya bụ Usoro Mmefu Ego.
Ọrụ ndị ọzọ pụtara ìhè n’Usoro Mmefu Ego ahụ gụnyere Ọrụ Mmiri Ọṅụṅụ 9th Mile, Ịrụtọpụ Ụlọ Ezumezu Mbaụwa International Conference Centre nke Dọkịnta Chimaroke Nnamani, onye chịburu Steeti ahụ malitere ihe karịrị afọ iri n’ise gara aga, wdg.