AKỤKỌ ỤWA

A GBAGBUOLA MMADỤ ANỌ N’IME NDỊ EKPERIME WAKPORO NDỊ UWE OJII N’ABA

Abụja: Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii Naịjiriya, CP Frank Mba ekwuola na ndị Uwe Ojii agbagbuola mmadụ anọ n’ime ndị ekperime ahụ wakporo ndị Uwe Ojii n’Aba, ma jidekwa mmadụ asatọ ndị ọzọ.

Ọ kọwara na ndị ekperime ahụ karịrị narị abụọ n’ọnụ ọgụgụ bụ égbè AK 47 na mma were wakpo ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’abalị, dị n’Okpuru Ọchịchị Osisiọma Ngwá nke Abia Steeti, n’isi ụtụtụ ụbọchị Tuuzdee ma jirikwa ogbunigwe “petrol” sunye ya ọkụ.

” ASP Vincent Gonze na Sgt Emmanuel Okoronkwo tufuru ndụ ha na mwakpo ahụ”

Ụnyahụ kwa, n’ebe Ụga, Anambara Steeti, ndi ekperime wakporo ndị Uwe Ojii, gbuo ha ma gbakwaa ụgbọala ha ọkụ.

“Ọma ákwà asa ahụ mara onwe ya. Ndị ekperime a na-achọ ibute agha n’Ala-Igbo, Uche ha dịkwa ya. Gịnị bụ uru ha?”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close