AKỤKỌ ỤWA

A KPỌWO NDỊ OHI ATỌ ỌKỤ NA KALABA

Kalaba: Ndị ntorobịa iwe dị n’obi nọrọ ụbọchị Satọdee na Kalaba, Krọs Riva Steeti were kpọọ ndị ohi atọ ọkụ.

Nke mbụ, e jidere ụmụ okorobịa abụọ n’okporo ụzọ Mayne dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Kalaba, ka ha wakporo ụlọ ndị mmadụ.

Ndị nche ógbè jidekwara onye ohi ọzọ n’ógbè Ikot Ansa dị n’ime Kalaba kpọmkwem.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na onye ohi onye ajọ chi ahụ bụ ótù onye n’ime ndị ohi atọ bịara ohi n’ógbè ahụ mana ndị ọzọ gbalagara.

Kaosiladi, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii na steeti ahụ, SP Irene Ugbo katọrọ etu e siri kpọọ ndị ohi ahụ ọkụ.

O kwuru hoo!haa!! na e kwesịrị inyefe ha n’aka ndị Uwe Ojii maka ikpe ha ikpe n’usoro iwu.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close