A KWADORO M ỌGỤ ỤGBỌELU NDỊ SOJA NA-ALỤSO NDỊ ESN N’Ọ̀LỤ́ – ỤZỌDỊMMA


Owere: Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo Steeti ekwuola hoo!haa!! na ọ kwadoro ọgụ ụgbọelu nakwa nke ala ndị soja na ndị Uwe Ojii nọ n’elu ya ugbua n’obodo ụfọdụ na mpaghara Ọ̀lụ́, ọ kacha n’Okpuru Ọchịchị Ọ̀sụ́ maka ozi ha nwetara na ndị ótù nchekwa Eastern Security Network (ESN) nke IPOB nwegasịrị ogige ọzụzụ.
N’ozi ya, Onye Ndụmọdụ Mgbasa Ozi nke Gọvanọ Imo Steeti, Oguwike Nwachukwu kwuru sị: “Ndi mmadụ na-atụ ụjọ n’ihe abaghi uru.
“Okpuru Ọchịchị Ọ̀sụ́ ebe ndị ọrụ nchekwa obodo ndị a nọ ọrụ ịma imi n’ala na Anambara Steeti gbara agbata obi; ha nọ ọrụ ịma imi n’ala, ọ bụghị imekpa onye ọbụla ahụ.
“Ụjọ atụla ndị mmadụ, ndị soja ahụ mara ihe ha na-eme “.
Lieutenant Babatunde Zubairu, Ọnụ na-ekwuru Ụ̀sụ̀ụ̀ ndị Agha nọ n’obi Nze kwukwara na ndị soja nọ ọrụ ịma imi n’ala n’Ọ̀sụ́ nakwa obodo ụfọdụ ndị ọzọ nọ na mpaghara Ọ̀lụ́, ebe ha nwetara ozi na ndị ESN nwere ogige ọzụzụ.
N’agbanyeghị nke a, ụjọ mmekpa ahụ ka na-atụ ọtụtụ ndị bi na mpaghara Ọ̀lụ́ maka na ndị soja Naịjiriya bụ ndị amaara dịka ndị ejighi iwakpo nakwa imegide ikike dịịrị ndị nkịtị kpọrọ ihe ọbụla.
Ha echefubeghi ihe ndị Obigbo, Rivas Steeti gabigara n’aka ndị soja Naịjiriya. Ụfọdụ n’ime ha ka nọkwa na nga ruo taa. Ebe a na-ebokwa ndị soja ebubo idinakwa ọtụtụ ụmụ nwanyị ha n’ike