A MACHIELA ỌDỤ NKWỤ NAKWA ỤLỌ NDỊ AKWỤLA NA SABON GARỊ

Kaduna: Onyeisi Oche, Okpuru Ọchịchị Sabon Gari na Kaduna Steeti, Alahaji Abdullahi Usman ekwuola na mmechi e mechiri ọdụ nkwụ na ọdụ ndị akwụla n’Okpuru Ọchịchị ahụ emeela ka ohi na mpụ belata ebe ahụ.
N’abalị iri abụọ nke ọnwa Juun afọ a, Okpuru Ọchịchị ahụ hiwere iwu nke e jiri machie írè mmanya ebe ahụ.
O kwuru na obi dị ndị Okpuru Ọchịchị ahụ ụtọ maka iwu ahụ, ebe o mere ka ohi na mpụ ebe ahụ.
Kaosiladi, Ndigbo ndị be ebe ahụ hụtara ya na iwu ahụ megidere ha maka na ọ bụ ha na ndị ọzọ n’abụghị ndị Alakụba bụ ndị na-ere mmanya nakwa ndị nwere ọdụ nkwụ.
Usman kwuru na akwụkwọ ndị a na-ere mmanya gbara n’ụlọikpe amịtaghị mkpụrụ maka na Ọkaikpe kagburu okwu ahụ.
Ihe mmere nke a ji ewute ọtụtụ mmadụ bụ na ndị a bụ ndị Alakụba ndị Úgwù na-aṅụkwa mmanya na nzuzo.
Kedụzi isi udiri akparamagwa mere mere n’ihu, gwọm piti n’azụ bụ nkea?