AKỤKỌ ỤWA

A MANYELA ONYE OHI ỌKỤKỌ KA Ọ TAA ỌKỤKỌ AHỤ NA NDỤ

Ndị mmadụ jidere ótù nwoke zuru ohi ọkụkọ na Tamale, mba Gana amanyela ya ka ọ taa ọkụkọ ahụ na ndụ.

Iwe ji ọhaneze maka na nwoke ahụ o teela nwoke ahụ zoro ọkụkọ ahụ n’ime uwe ya bidoro ime aka ntụtụ.

Nkata kkpudoro ya oge ọkụkọ ahụ bidoro yiwe “kwaaa! Kwaaa!!”

N’onyonyoo wụsa woro n’ọba ozi, ndị gbakọrọ ebe ahụ manyere ya ka ọ taa ọkụkọ ahụ nqa ndụ iji gbalahụ ihe a na-eti ya ka e tigbuo ya.

Ótù onye n’onyonyoo ahụ sọnyere ya ọkụkọ ahụ n’ọnụ, sị ya tawa ya ebe ọ chọrọ ịta anụ ọkụkọ.

Nwoke onye ohi ahụ tara isi ọkụkọ ahụ tupu bido gbọwa ágbọ̀.

Hmm, ọ bụrụ etu ahụ, e jide ndị ọchịchị ndị na-ezu ego obodo, a ga-afọnyekwa ha ya n’ọnụ ka ha taa?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close