AKỤKỌ ỤWA
A NWUCHIKỌỌLA NWATAKỊRỊ NWOKE ỌRỤ YA BỤ IKESA NAIRA ADIGBOROJA


Yola: Ngalaba ndi Uwe Ojii n’Adamawa Steeti a nwuchikọọla, Eson Fatgoel, onye dị afọ iri abụọ n’isii, onye ọrụ ya bụ íkesa Naira adigboroja na Steeti ahụ.
Ndị Uwe Ojii jidere ya ụbọchị Satọdee n’Okpuru Ọchịchị Numan.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, DSP Suleiman Yahya Nguroje, nọrọ ụbọchị ụka were gwa ndị nta akụkọ na Fatgoel nọ na – ekesa ma na-erikwa ego adigboroja n’ime obodo dịgasị n’Okpuru Ọchịchị Guyuk na Lafịya
Nguroje dọkwara ndị ahịa aka na ntị maka ịnata ego adigboroja nke ka jupụtara na Steeti ahụ.