AKỤKỌ ỤWA

A NWỤCHIKỌỌLA NWOKE FULANI CHỌRỌ IJI OGBUNIGWE GBARIE Ụ̀SỤ́Ụ́ NDỊ AGHA NA LEGỌS

Legọs: A nwụchikọọla ótù nwata nwoke onye Fulani, Ibrahim Abdullahi, onye nke e jidere ka ya ndị ótù ya, ndị gbalagaworo, bu ogbunigwe bata n’ụ̀sụ́ụ́ ndị agha Nigerian Army, Ikeja Cantonment, Legọs.

Ndị nche ndị soja kwụsịrị ya bụ nwaamadị dị afọ iri abụọ na anọ ya na ndị ótù ya maka na akpeha bu mere ka e nyoo ha enyo. E nwetazịrị ogbunigwe n’ime akpa ha.

Ndi soja nyefere ya n’aka ndị Uwe Ojii ndị kpụgara ya n’ihu ụlọikpe Majie n’Ebute Meta, Legọs ebe Majie O. O. Oshoniyi nyere iwu ka nwaamadị ahụ nọrọ na nga ruo na ndị Uwe Ojii e mechaa nnyocha ha, were mara kwuo ma ha a ga-ejide ndị ótù ya gbara ọsọ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close