AKỤKỌ ỤWA
A TỌ̀Ọ̀RỌ̀ M N’ỤLỌ UKA, RESỊ M NDỊ NTỌ NDỊ FULANI – ESENE


Bini: Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Ọrụ Nigerian Immigration Service, Ngalaba Edo Steeti, Brijeeti Esene, ekwuola na ndị tọ̀ọ̀rọ̀ ya n’ụlọ ụka buuru ya resị ndị ntọ ndị Fulani.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Wenezdee, Esene kwuru sị,
“Ndi Oji égbè dị mmadụ ise wakporo m n’ụlọ ụka m di n’Ikhueniro dịdebere Bini.
“Ha resịzịrị m ndị ntọ ndi Fulani, ndị kpọrọ m banye n’ime ime oke ọhịa. Ndị nche ógbè na ndị Uwe Ojii bụ ndị zọpụtara m”