A TỤỌLA OGBUNIGWE N’ỤLỌ ỤKA NNA GỌVANỌ WIKE


Pọt Haakọtụ: Ndi Uwe Ojii Naịjiriya Ngalaba Rivas Steeti na-ekwu na ha anwuchikọọla ndị ekperime gara tụọ ogbunigwe n’ụlọ ụka nna Gọvanọ Steeti ahụ, Nyesom Wike ụbọchị Satọdee.
Ụkọchukwu Nlemanya Wike, nna Gọvanọ Nyesom Wike bụ ya nwe ụlọ ụka Christian Universal Church International nke dị n’ebe Okporo Ụzọ Azikiwe n’ógbè Mile 3, Diobu na Pọt Haakọtụ.
Ọ bụ ndị nche ógbè nke Okporo Ụzọ Azikiwe jidere ndị ekperime ahụ.
Mazị Kọlịnsị Jọnbuulu, Osote Onyeisi Nche ógbè ahụ kwuru sị, “N’abalị Satọdee n’ebe elekere asatọ, anyị hụrụ mmadụ ise banyere ụlọ ụka nna Gọvanọ Wike.
“Maka etu ha siri gaa ije, anyị ledoro anya ebe ahụ. O teghi aka tupu anyị anụ ụda ogbunigwe n’ime ụlọ ụka ahụ. Anyị hụkwara mmadụ ise ahụ kpuchiri ihu ha ka ha na-agbazi egbe aghara aghara”.
O kwuru na ha jidere mmadụ atọ n’ime ha ndị ha nyefeworo n’aka ndị Uwe Ojii. Onye òtù ha a gbara égbè nọkwa n’ụlọ ọgwụ.
Hmm, nna Onye ike Wike bụ Ụkọchukwu? Unu na-egekwa?
