A TỤWO BISHỌỌPỤ LEGỌS NGA MKPỤRỤ ỌKA MAKA ỊDAKPO ỤKỌCHUKWU ỤKA YA
Legọs – Ụlọikpe Legọs Steeti maka Mpụ́ Akwamiko na Imerụ Ụmụ nwanyị ahụ n’ụlọ dị n’Ikeja atụwo Bishọọpụ Oluwafeyiropo Daniels, nga mkpụrụ ọka maka ịdakpo ụkọchukwu nwanyị n’ụlọ ụka ya bụ ‘I reign Christian Ministry’ n’ọnwa Juun, afọ 2020.
Ọkaikpe Rahman Oshodi tụkwara ụkọchukwu arụrụala ahụ nga afọ atọ ọzọ maka ịdakpo ndị ụka ya mmadụ abụọ ndị ọzọ.
Oshodi kwukwara na ụlọikpe ahụ kwenyere n’akaebe nke ndị ọkaiwu oboebubo(plaintiff) ikpe ahụ wetara nke gosiri na onye ahụ e boro ebubo mere ndakpo, etu ọ siri dị na mpaghara nke 260(2) nke iwu banyere mpụ́ Legọs Steeti nke afọ 2015.
Ụlọikpe ahụ nyekwara ntuziaka ka e debanye aha onye ahụ a mara ikpe n’akwụkwọ Ndị Ome Ndakpo nke Legọs Steeti.
Tụfiakwa! Chineke ekwela ka ngwere gbaa ajị. Kedu ka udiri oke mkpi si bụrụ ụkọchukwu, fọdụzịa ịbụ bishọọpụ?
O doroanya na Chineke akpọghị ya, ikekwa ọ bụrụ ekwensu kpọrọ ya.