A TỤWO ÓTÙ NWAAMADỊ KANO JI MMA SỤGBUO MMADỤ MAKA ENYI YA NWANYỊ NGA MKPỤRỤ ỌKA



Kano – Ụlọikpe Kano Steeti nọrọ ụbọchị Tọzdee gara aga were tụọ ótù nwaamadị bụ Nura Sabiu, dị afọ iri abụọ na abụọ, nga mkpụrụ ọka maka iji mma sụgbuo Abba Isma’il, dị afọ Iri na asatọ. A tụkwara Dahiru Ubale, dị afọ iri abụọ na otu, nga afọ ise maka
Ọkaiwu wetara ikpe ahụ, Lamido Sorondiki gwara ụlọikpe ahụ na ndị ahụ a na-ebo ebubo nọrọ n’abalị iri na asaa nke ọnwa Eprel afọ 2017 na Jalabi dị n’Okpuru Ọchịchị Bunkure nke steeti ahụ, kpaa nkata wee jiri mma wakpo ya bụ nwaamadị laworo mmụọ.
Ọkaiwu mkpesa ahụ kwuru na nke ahụ megidere iwu ala Naijiriya isiokwu 97 na nke 221.

Ọkaiwu nzọta, Umar Danbaito kpọlitere ndị akaebe atọ, tinyere ndị ahụ e boro ebubo.
Ọkaikpe Usman Na’abba kwuru na ndị mkpesa kọwapụtara okwu ha n’ebe enweghị mgbagwoju anya ọbụla.
“N’ihi ya, a tụwo m Sabiu nga mkpụrụ ọka, tụkwaa Ubale nga afọ ise”
Hmmm, nwoke nwanyị egbughi ga -aka nka