ABIA STEETI NA-ECHE NDI ỤLỌ NZUKỌ OMEBEIWU TUPU IWEPỤTA USORO NHỌPỤTA OKPURU ỌCHỊCHỊ – GỌVANỌ OTTI



Ụmụahịa – Gọọmenti Steeti Abịa ekwuwo na ọna-eche ka Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Steeti ahụ hazichaa okwu ụfọdụ banyere imebe iwu tupu ịmalite okwu banyere ime nhọpụta Okpuru Ọchịchị Imeobodo na steeti ahụ.
N’okwu ọ gwara ndi nta akụkọ n’Ụmụahịa, Aka na-achị Steeti Abịa kwuru sị, “Usoro Nhọpụta Okpuru Ọchịchị Imeobodo ga-apụta ozigbo ndi Ụlọ Nzukọ Omebeiwu hazichara okwu imebeiwu banyere ya”
Cheta na Onyeisiala Naịjiriya, Sinetọ Bola Ahmed Tinubu nọrọ na nso a tinyeaka n’Iwu Okpuru Ọchịchị Imeobodo nke afọ 2024, nke mezịrị ka Okpuru Ọchịchị Imeobodo kwụụrụ onwe ya dịka Nkeji ọchịchị nke atọ ala anyị, gharazịa ịbụ mgbakwunye nke Ọchịchị Steeti.
Ka ọ dị ugbua, steeti dị iche iche etinyewo ụbọchị ha ga-eme nhọpụta Okpuru Ọchịchị steeti ha. Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya, Ebọnyị mere nke ha n’ọnwa gara aga (Julayị), Anambara etinyewo nhọpụta nke ha n’ọnwa Septemba (ọnwa n of abịa abịa) ebe Enugwu ga-eme nke ha n’ọnwa Ọktoba.
O doro anya na ndi Gọvanọ steeti nile na-agba mbọ ime nhọpụta nke ha tupu Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya ekpebie usoro ime nhọpụta Okpuru Ọchịchị Imeobodo ebe nkeji ọchịchị ahụ kwụzịrị onwe ya.