AKỤKỌ ỤWA

AFENIFERE JỤRỤ IKWADO BUHARỊ NA NHỌPỤTA 2015, 2019 MAKA NA MPỤ NA ỊKPA OKE BỤ EJIRIMARA YA-FASORANTI

Akure: Òtù Afenifere ekwuola hoo!haa! na ajọ ọnọdụ nchekwa, mpụ na ịkpa oke bụ ejirimara Onyeisiala Muhammadu Buhari n’ime afọ isii ọ nọworo n’ọkwa ọchịchị.

N’okwu ya ụbọchị ụka, n’Ụlọ ụka ukwu Onye Nsọ Devidi, Akure, Ondo Steeti n’ofufe nru ịtụ mma ma maka Ncheta Ịgba Afọ iri asaa nke òtù ahụ, Ichie Ruben Fasoranti, onye bụbu Onye Afenifere kọwara na ọ bụ ajọ akparamagwa ndị a mere ha jiri jụ ikwado ya ma na nhọpụta nke mbụ ma nje abụọ ya.

Fasoranti kwuru sị, “Ajọ ọnọdụ nchekwa, mpụ na ịkpa oke na-arị ibe ya elu ugbua gosiri na anyị mere ihe ziri ezi site na ịjụ ịkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari.

“Ọ naghị eme ọfụma chaa chaa. Enweghị ezi nchekwa juru ebe nile. Ọ pụtara na mkpebi anyị n’akwadoghi ya bụ maka ọdịmma ndị Yoroba na ndị Naịjiriya nile.

“Leenu ndị nile mere mpụ dị iche iche ka ọ hapụrụ n’ọkwa, ka ha mere mpụ na-aga. Ekene dịrị Chukwu na o nweghị oge anyị kwadoro ya”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close