NKE NA-EME UGBUA

“ÁFỌ́ TARA BUHARỊ MMIRI, O KWUGHI MAKA NKWAFU ỌBARA LEKKI – PDP

Abụja: Ótù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP akọwaala Onyeisiala Muhammadu Buharị dịka “nwoke áfọ́ tara mmiri” maka na o leghara anya ikwu banyere Nkwafu Ọbara Lekki na okwu ọ gwara ndị obodo Naịjiriya n’abalị ụnyahụ.

N’ozi o zigaara ndị nta akụkọ, Ode akwụkwọ Mgbasa ozi PDP na Naịjiriya, Mazị Kunle Ologbodiyan kwuru na okwu ahụ Buharị gwara ndị Naịjiriya tọgbọ chakoo.

“Ọ dị mwute na Onyeisiala Muhammadu Buharị dịka Ọchịagha Izugbe ndị agha ala Naịjiriya enweghị ihe bara uru o nwere ịgwa ụmụ amaala Naịjiriya maka ọnọdụ nchekwa ha, ọ kacha ka o siri gbasa Ngagharị iwe #EndSars na Nkwafu Ọbara ndị ntorobịa ụmụ amaala Naịjiriya gba aka na Lekki ụbọchị Tuuzdee.

“Buhari ekwutedighi banyere ndị ahụ ndị Soja gbagburu chaa chaa n’okwu ya. Nke a gosiri na n’ezie, áfọ́ tara ya mmiri”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close