NKE NA-EME UGBUA

AJAMBENE NLỌTA”KANKARA BOYS”

Aka ndị Gọvanọ Katsina na Zamfara dị na arụ ndị ekperime a na-akpa – Maịk Ejiọfọ

Katsina: N’uhuruchi Tọọzdee, Odeeakwụkwọ Gọọmentị Katsina Steeti, Alahaji Mustafa Ịnụwa kwuru na ndị Ekperime atọhapụwo ụmụ akwụkwọ ụmụ nwoke narị iri atọ n’anọ nke Government Science Secondary School, Kankara, Katsina Steeti e ji kemgbe Fraịdee gara aga.

Ịnụwa kwuru na e si Tsafe dị na Zamfara Steeti ebulata ha na steeti ha bụ Katsina.

Kaosiladi, Mazị Maịk Ejiofo, onye jibu ọkwa dịka Onye Nlekọta Ụlọ ọrụ nchekwa DSS nọrọ n’ụtụtụ taa, na Mmemme Ụlọ Mgbasa ozi Channels TV bụ Sunrise Daily kwuo na “aka ndị Gọvanọ na – achị Katsina na Zamfara dị na – arụ nile ndị ekperime ahụ na-akpa”

“Kedụ ka Gọvanọ Katsina na ndị ekperime a si malite mkparịta ụka ntọhapụ, ebe ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa kwuru na ha esonyeghi na mkparịta ụka ahụ?”

Chetakwa na òtù ndọrọndọrọ ọchịchị APC na-ebo ebubo na aka Gọvanọ Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Ugwu dị na mkpa mkpa ndị ekperime na-akpa na mpaghara ahụ.

Kaọdịtaa, o nweghị onye mara ego ole Gọọmenti kwụrụ ndị ekperime a mana Kepu Kepu anyị na-anụ sị na ego mgbapụta a kwụrụ bụ Nde Dọla anọ?

Gọvanọ Aminu Bello Masari nke Katsina Steeti kwuru na a kwụghị ego mgbapụta ọbụla mana Onyeisiala Muhammadu Buharị kwuru na a kwụrụ.

Nke bụ eziokwu bụ na ndị Gọvanọ Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Ugwu, ọ kacha ndị nke Katsina na Zamfara, na aka ha adịghị ọcha.

Obodo adịghị mma bụ uru ndị Nze. Ma ndị ntọ ma ndị mgbapụta, ha nile na-egbunye n’ótù akpa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close