AKỤKỌ ỤWA

AKA AKPARALA BISHỌỌPỤ LEGỌS ONYE JI AKWAMIKO MEKPAA ỤMỤ NWANYỊ NDỊ ỤKA YA AHỤ

Legọs: Aka ndị Uwe Ojii si na mpaghara Ụlọ Ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’ Elemoro na Legọs Steeti akparala ụkọchukwu arụrụala, Bishọọpụ Kris Ọmọsekpa, nke Ụlọ ụka Peculiar Generation Assembly dị n’Eputu London nọ n’Awoyaya, Ibeju-Lekki, Legọs, onye ji akwamiko mekpaa ụmụ nwanyị ndị ụka ya ahụ.

Nke ahụ sitere na Ikike Mkpọchi nke Ọkaikpe R. A. Oshodi nke Ụlọikpe Legọs Steeti Pụrụ iche na – ahụ maka arụrụala akwamiko.

Omosekpa, site n’ozi hoo!haa!! wakporo ma dinakwaa ụmụ nwanyị ole na ole ndị ụka ya n’ike. Ụfọdụ n’ime ha bụkwa ụmụaka. Ya bụ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu na enweta ndị ahụ site na iburu ha amụma asị nakwa ịchakpo ha anya.

N’ozi ya, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, SP Benjamin Hundeyin, kwuru sị: “Nnwuchikọ a nwuchikọrọ ya bụ nwaamadị bụ site na Ikike Mkpọchi sitere n’aka Ọkaikpe R. A. Oshodi”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close