AKA AKPARALA DI NA NWUNYE ADAZI-ANI CHỌRỌ ỊKPỌGBU NWA HA DỊ AFỌ ISE N’AGỤỤ, NA PASỊTỌ KPỌRỌ YA AMOOSU



ỌKA – Aka ndị Uwe Ojii Ngalaba Anambara Steeti akparala Mazị Maịkel Egosi(47) na nwunye ya Blessing(23) ndị chọrọ iji agụụ kpogbuo obere nwa ha nwaanyị di afọ ise maka na pasịtọ ha kwuru na ọ bụ amoosu.
Maikel kọwara na pasịtọ ha kwuru na obere nwatakịrị nwanyị ahụ bụ amoosu, na o kwesịghị ka ahapụ ya ndụ maka na ọ bụ ya mere na ihe anaghi agara ya nke ọma kpatara na ya enwebeghi ego ka ibe ya, n’agbanyeghị mbọ nile ọ gbaworo.
Nwoke ahụ bụ onye Rivas Steeti ebe nwunye ya bụ onye Akwa Ibom Steeti mana ha bi n’Adazi Ani dị n’Okpuru Ọchịchị Anaọcha n’Anambara Steeti.

N’okwu ya, Kọmishọna na-ahụ maka Ụmụ nwanyị nakwa Ọdịmma Ọha, Ify Obinabọ kelere Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Anaọcha, Mazị Gerald Ọzọ nakwa Onyeisi òtù Ladies of Good Governance, Oriakụ Chinwe Uba, ndị wetara mkpesa ahụ.
Ọ gwakwara ajọ nne na nna ahụ na ọrụ ya bụ ilekọta ikike dịịrị nwatakịrị ọbụla bi na steeti ahụ, n’agbanyeghị steeti o si. O kwukwara na ha ga enweta ntaramahụhụ n’ihu.