AKA AKPARALA DI NA NWUNYE LEGỌS NA-EME NKUPUTA NWA HA ZURU EZU
Legọs – Aka ndi Uweojii Ngalaba Steeti Legọs akparala mmadụ ise, tinyere di na nwunye ndi aka ha dị n’ozuzu na orure nwa ọhụrụ dị ọnwa abụọ.
Benjamin Hundeyin, Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii Steeti ahụ kwuru na ndi Uweojii si n’ụlọ ọrụ ndi Uweojii nke Oko-Oba nwuchikọrọ ha ụbọchị Satọdee site mkpesa nke obere nwatakịrị nwoke ahụ wetara.
“Nwaanyị ahụ wetara mkpesa na otu onye n’ime ndị ahụ e jidere, Gloria kuru nwa ya gbalaga n’abalị iri na otu nke ọnwa Julayị a.
“Ka e jidere Gloria, o kwuru na ya resịrị Ụkọchukwu Pita nwa ahụ N500,000.
“Ụkọchukwu Pita, oge e jidere ya n’Ikenne, Steeti Ogun kwuru na ya resịkwara otu nwaanyị bụ Lọrịta nwa ahụ N1.4N.
”Ka e nwudere Lọrịta na Festac Town, Legọs, o kwupụtara na o regharịrị nwa ahụ N2.3N.
Hundeyin kwukwara na nwaanyị ahụ dugara ndi Uweojii na nke di na nwunye o resịrị nwa ahụ, ndị na-eme mmemme nkuputa nwa oge aka kpaara ha.
O kwuru na a ga-akpụpụ ha nile ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.
hmmmm, ụwa dị egwu. Nwa nwaanyị ibe unu mụrụ ka unu ji agba mgbere ahịa. Tụfịakwa!