Uncategorized

AKA AKPARALA ENWEREM, ONYE GWUNAHỤRỤ NWANYỊ DỊ AFỌ IRI ASATỌ $31,500 N’AMERỊKA

Aka akparala Dexter Enwerem, nwa-afọ Ikeduru nọ n’Imo Steeti, onye dị afọ iri atọ n’anọ maka igwunahụ ótù agadi nwanyị dị iri afọ asatọ ego dị $13,500.

Ndị Uwe Ojii Norwich, Connecticut kwuru na ya bụ nwaamadị so n’ótù ụmụ afọ Naịjiriya ndị aka ọrụ ha bụ isi n’ekwentị gwunahụ ndị ọcha ego.

Site n’ozi si n’aka ụlọ ọrụ Ndị Uwe Ojii, ngalaba Norwich nke ha wepụtara ụbọchị Wenezdee, ha malitere ime nnyocha banyere Enwerem n’ọnwa Septemba afọ 2020, oge ótù nwoke wetara mkpesa na ọgọ ya nwanyị dị afọ iri asatọ na – ezigara onye ha amaghị ego “maka enyemaka ndị n’enweghị ebe obibi”.

Ego agadi nwanyị ahụ zigara nwaamadị ahụ, onye a chọpụtara na aha ya bụ Dexter Enwerem ego dị $13,500 na $18,000

Ka Scott Meikle, onye Uwe Ojii mechara nnyocha miri emi, e kpebiri na Enwerem so na ótù ụmụ afọ Naịjiriya ndị aka ọrụ ha bụ isi n’ekwentị gwunahụ ndị mmadụ ego.

Ntorobịa Igbo, mụtanụ ihe. Igbu ozu, igbu ozu, oge ọbụla. Chetakwa nụ na onye rie n’ike, ọ laa n’ike. Uru adịghị n’isi azụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close