AKA AKPARALA NWA AGBỌGHỌ YA NA ENYI YA NWAANYỊ RERE NWANNE YA NWOKE DỊ AFỌ ANỌ
Yola – Aka ndi Uweojii Ngalaba Steeti Adamawa akparala ótú nwa agbọghọ, Blessing Okonkwo, 24, onye ya na enyi ya nwaanyị, Ifunanya Nnabuife, 35, ndi bi na Mubi dị na steeti ahụ jikọrọ aka ree nwanne ya nwoke, Friday Okonkwo, dị sọọsọ afọ anọ.
Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii Steeti ahụ, SP Suleiman Nguroje kwuru na ndị ahụ a na-ebo ebubo ekwuputawo na ha mere ya.
N’okwu ya, nne nwatakịrị ahụ, Hauwa Lawan, onye bi na Rimirgo dị n’Okpuru Ọchịchị Askira Uba na Steeti Borno sịrị na ọ tụrụ ya n’anya etu nwa ya nwaanyị siri wee resi onye ọmaghị nwanne ya nwoke. E tiweghi m mkpu enyemaka maka na a tụghị m anya na o nwere ire nwanne ya n’afọ.
“Oge ọbụla m jụrụ ya maka nwanne ya nwoke, ọ tụọrọ m ótú àsị́ . O nwere oge ọ gwara na ya tinyere ya n’ụlọ akwụkwọ ebe obibi. O megidere, ike gwụzịa m ịjụ ya.
“Chineke meziri amara, o nwere onye bịara ịlụ ya ọ kpọrọ gaa Ala-Igbo ịga gosi nna ya. Ka ọ gwara nna ya na nwanne ya nwoke ahụ anwụwo, ọ gara gbaa áfá, e were gwa ya na nwatakịrị ahụ ka dị ndụ.
“Oge nna ya siri ọnwụ na ọ gaghị anụ akụkọ ọbụla banyere onye chọrọ ịlụ ya ma ọ bụrụ na o kwughi ebe nwanne ya nwoke nọ, ọ gwazịrị ya na nwanne ya nwoke na mmadụ bi n’Enugwu. Nke mere m ji gaa kpesara ndi Uweojii Ngalaba Steeti Borno”
Nguroje kwuru sị,”N’abalị abụọ nke ọnwa Julayị, afọ a, ótú nwata nwaanyị,Hauwa Lawan bi na Rimirgo dị n’Okpuru Ọchịchị Askira Uba nke Steeti Borno, wetara mkpesa n’aka Ngalaba ndi Uweojii nke Steeti Adamawa na e zuuru nwa ya nwoke, Friday Okonkwo, onye dị afọ anọ.
“Ozigbo ahụ, Kọmishọọna ndi Uweojii anyị, Dankombo Morris, nyere Onyeisi Ụlọ ọrụ ndị Uweojii nọ na Mubi, SP Aaron Ezra ntimiwu ka ọ malite ị́mà imi n’ala. Site na mmasị Chineke, a nwuchikọrọ mmadụ abụọ ahụ a na ebo ebubo, Blessing Okonkwo, 24 na Ifunanya Nnabuife, 35.
“A ga-ewepụ okwu ahụ ụlọikpe ozigbo e mechara nnyocha”
Okenye iberibe ahụ bụ Blessing kwuru na ya ji ego nke ya zụọ ígwè ògwé ihe (grinding machine) na ekwentị, nyekwa onye na-achọ ịlụ ya N200,000.