Uncategorized

AKA AKPARALA NWANYỊ DỊ IME NA NDỊ ÓJÍ EGBE EZU NDỊ ÓTÙ YA

Bini: Aka ndị Uwe Ojii akparala nwanyị dị ime na ndị ótù ya ụmụ nwoke abụọ na Bini, Edo Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na nwanyị ahụ na-anọ n’akụkụ okporo ụzọ na-eme ka ímé a na-eme ya. Ndị ótù ya na – amapụtazị jiri égbè zuo onye ọbụla bịara inyere nwanyị ahụ aka ohi.

Aha ndi ohi ahụ bụ Jumoke Akanbieme, Osagiede Izevbokun na Gọdịfrị Okonide.

E jidere ha n’Okporo ụzọ Murtala Mohammed, Bini ebe ha zuru ụgbọala Toyota, nke onye chọrọ inyere nwanyị ahụ dị ime aka.

Ha buru onye ọ̀kwọ́ ụgbọala ahụ n’ụgbọala ya gawa Okporo ụzọ Sakponba, ebe ha kwapụrụ ya were na-achọ igbu ka akụkụ ụgbọala ahụ maka orure tupu ndị Uwe Ojii wakpo ha.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Chibụzọ Nwabụzọ kwuru na nnyocha na – aga n’ihu maka okwu ahụ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close