AKA AKPARALA ÒJÌÉGBÈÈZÚ NWA-AFỌ IGBO NA-AKPA IKE NA LOS ANGELES



Aka ndị Uwe Ojii akparala Ótú nwaamadị Charles Chukwuma Onwuemelie, 29, na Los Angeles, California maka iji égbè ezu ohi.
Ya bụ nwaamadị ahụ, onye bi na Quartz Hill, Los Angeles ejiriwo égbè gaa ohi ihe ruru ugboro iri isii na asatọ kemgbe ọnwa Ọktoba, afọ gara aga.

Ekperime ahụ malitere ịkpa ike a ka o mechara mmemme agbamakwụkwọ wuru ewu ebe ahụ.
Ndi Uwe ojii chọpụtara na ezobe onwe ya site na iyi udiri okpu dị iche iche, iyi mkpuchi ihu(face mask) nakwa ịgba mkpuchi aka (hand gloves) tupu ọ wakpo ndị mmadụ n’ọ́dụ̀ mmanụ ụgbọala, ụlọ ahịa Walmart nakwa ebe ndị ọzọ.
Ọ na-ejikwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ (Blue)were ekechi égbè ahụ o ji awakpo ndị mmadụ, nke e nwetakwara n’ụlọ ya.
A kpụpụrụ ya ụlọikpe na Los Angeles n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Septemba, afọ a maka iji égbè aga ohi na mpaghara Los Angeles.
Hmmm, kedu udiri akụkọ bụ ihe? Igbo unu dịkwa ẹ́gwù. Kedu nke bụ mmadụ isi Ala-Igbo gaa mba Amerịka, ọ bụrụ ịga bụ òjìégbèèzú? Biko, o chere na ọ nọ n’Upper Iweka?