AKA AKPARALA ỌKAIWU ADIGBOROJA N’IME ỤLỌIKPE BADAGRY



Legọs – Aka ndi Uweojii akparala otu nwata nwoke, Godwin Eguabor, onye bụ ọkaiwu adigboroja n’ụlọikpe majie nọ na Badagry ka ọ bịara ikpere mmadụ ikpe ụbọchị Wenezdee.
Atule Elchors, Osote Onyeisioche òtù Nigerian Bar Association (NBA), ngalaba Badagry, kwuru na o teela o ji anụ na e nwere onye n’abụghị ọkaiwu na-ekpere ndi mmadụ ikpe na Badagry tupu o ji anya ya hụ ekperime ahụ n’ime ụlọikpe ụbọchị ahụ.
“Ozigbo o kulitere n’ụlọikpe gwa majie na ya bịara ikpere mmadụ ikpe, e biliri m were kwuo na nwaamadị ahụ abụghị onye ọkaiwu, na o teela anyị ji achọ ya
“A jụrụ ya akara ndebanye aha Ụlọikpe Mkpedebe mana ọ nọ na -atagheri ọnụ”
A kpụgara ya ụlọikpe majie ụbọchị Tọzdee maka ime onwe ya ọkaiwu nke ọ na abụghị.
L.A. Layeni, Majie ji okwu ahụ nyere ntuziaka ka e jiri otu nde Naịra nara ya n’aka ebe.
E higharịrị ikpe ahụ n’abalị iri na itoolu ọnwa Febrụwarị.
hmmmm, nkata ekpudowo onye aghụghọ. Ya bụ ezekudele ga-ekwuzi mmụọ chiri ya ọzọ