AKỤKỌ ỤWA

AKA AKPARALA ONYE NTỌ BINI EBE Ọ BỊARA ỊZỤTA NRI

Bini – Aka ndị Uweojii Naijiriya ngalaba Edo Steeti akparala James Imelayi (35), onye a na-ebo ebubo ị́tọ̀ mmadụ, oge ọ bịara ịzụta nri maka ndị òtù ya nakwa ndị ha tọ̀ọ̀rọ̀.

A na-ebo ya na ndị òtù ya ebubo ịtọrọ Lillian Ofonsare, onye bụ onye nkuzi n’ụlọakwụkwọ Praịmarị Ukara dị n’Ologbo nke dịdebere Bini.

Ya bụ nwaamadị sịrị na ọ bụ maka inweta ego iji rụzi ụgbọala ya mere o ji soro ndị enyi ya tinye aka na ntọrị.

O kwuru sị, “Anyị gara n’ụlọ akwụkwọ ebe ọ na-akuzi were chebiri ya. Anyị ji égbè were tọrọ ya. Anyị ji ụkwụ baa n’ime ọhịa, werezie ụgbọ mmiri gafee osimiri Ologbo gaa ebe anyị zoro ya were malite ịna nne na nna ya Nde Naịra ise dika ego mgbapụta.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii na steeti ahụ, Chidi Nwabụzor kwuru na ha nwụchikọrọ ya bụ onye ntọ site na ọ̀gbụ́gbáàmà dị ire ha nwetara.

Hmm, ọ bụ Chi ya bụ nwata nwanyị mere onye nzuzu a jiri rapụta onwe ya.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close