AKỤKỌ ỤWA
AKA AKPARAWO NWOKE LEKKI NA NKỊTA YA ATỌ TAGBURU ONYE NCHE
Legọs – Aka ndi Uweojii na Steeti Legọs nọrọ ụbọchị Tuzdee were kpara ótù nwaamadị, Salisu Mustafa, bi na Ogige Obibi Pinnock, Ilasan, Lekki, onye nkịta ya atọ tagbunyụrụ onye nche anya.
Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na steeti ahụ, Benjamin Hundeyin kwuru nke n’ụbọchị Wenezdee kwuo na Kọmishọna ndi Uweojii na steeti ahụ, Olanrewaju Ishola rịọrọ ndi steeti ahụ nile ka ha wetuo, na ha ga ahụ isi okwu ahụ.
Hundeyin kwukwara na ha nwuchikọkwara nkịta atọ ahụ.
Nkea sitere n’oke iwe juru ndi mmadụ obi, oge onyonyoo wusara ebe nile na-egosi ebe nkịta atọ ahụ na -agba ozu ya bụ onye nche ha tagburu gburugburu, na-aracha ya
Biko, kedu ihe mmadụ ji isi kote na Naịjiriya? Ka mkpuruobi onye nche a zuruike na ndokwa