AKỤKỌ ỤWA
“AKỤKỌ BỊAFRA BỤ AKỤKỌ NDỊ ARA” – ỤMA ỤKPAỊ

Uyo: Ụkọchukwu a maara ama, Ụma Ukpai, akatọọla ndị na-akọ akụkọ inweta Biafra dịka ndị MASSOB na IPOB.
Ụkpaị, Onyeisi Uma Ukpai Evangelistic Association, kwuru hoo!haa! na ndị na-agba mbọ inweta ala Bịafra bụ ndị ara.
Ozi si n’aka ụlọ ọrụ NAN kwuru na Ụkpaị kwuru nkea n’Uyo, Akwa Ibom Steeti ka ọ na-agwa ndị ụka ya okwu ụbọchị Tuuzdee.
O kwuru sị, ” A ga-enwerịrị ndị ara, ọ bụgoduru oge isi dị ndị ọzọ mma.
“Onye ọbụla na-agba mbọ inweta Biafra na-egosi ka ara ji ya ha, mana ara ji onye ọbụla, sọọsọ ihe dị iche bụ ka ara nke gị ha”