AKỤKỌ ỤWA

ÀKWÁ ỌKỤKỌ TIWARA AKỊ, DIBIA NWERE ‘SWAG’ NA-AGA ỤLỌ ỤKA ỊTỤ MMAMMA NA CHUKWU ZỌPỤTARA YA N’AKA NDỊ NTỌ̀

Ọnịcha – Dibia Anambara Steeti, okwu ya na -ada gbowam, Chukwudozie Nwangwu, onye a makwaara dịka Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị ka anyị nụrụ na ọ na-aga ịtụ mmamma n’ụlọ ụka ikene Chineke, onye zọpụtara ya n’aka ndị ntọ.

Ya bụ dibia, onye nwere ‘Swag’ ma jirikwa ‘packaging’ ọgbara ọhụrụ arụ ọrụ dibia ya site na itinye ọbaozi mmekọrịta dị iche iche dika Facebook n’ọrụ ka ndị ntọ anya na-enwu ọkụ nọrọ na nso were tọrọ.

Ndị òjìégbè ahụ gbagburu ndị nche ya mmadụ abụọ tupu tọrọ ya. Ọ tụrụ ụwa nile n’anya nke ukwuu, na ya bụ ‘oke dibia’ na-enye ndi ọzọ ike dị iche iche enweghị ike mee nke o jì bụrụ odogwu oge ndị ahụ wakporo ya.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ọ ga-eme ya bụ ịtụ mmamma n’ụlọ ụka ndị Angịlịkaanụ n’Ọ̀bà nke dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Idemili.

Hmmmm, “Ụwa ntọọ! Ụfọdụ ndị ụ́kọ̀ ga-anọkwa ya bụ nwa dibia eburu uzọ ha ụzọ baa Ala-eze Chineke”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close