AKỤKỌ ỤWA

AKWAMIKO ABỤGHỊ NJỌ KACHA NJỌ – POOPU FRANSIISI

Poopu Fransiisi ekwuwo na akwamiko abụghị njọ kacha njọ.

Ya bụ isi ụka Katọliki na mbaụwa kwuru nke a oge ọ na-etinye ọnụ n’okwu banyere Aachbishọọpụ Au Petit nke ụka Katọliki na mba Frans onye nke gbara alụkwaghịm n’ọrụ ya dịka Aachbishọọpụ maka ebubo akwamiko e boro ya.

Ụbọchị Mọnde, oge Pena-agwa ndị nta akụkọ okwu, kwuru sị, “N’agbanyeghị na Aachbishọọpụ Au Petit dara iwu nke isii, njọ nke anụ ahụ abụghị njọ kacha njọ.

“Anyị nile bụ ndị njọ. Mgbe asịrị rịwara ibe ya elu nke imebi aha mmadụ, onye ahụ agaghịkwa enwe ike ịnọnwu n’ọkwa. Ya mere m jiri nabata akwụkwọ alụkwaghịm ya”

Okwu a Poopu Fransiisi kwuru butere ezigbo mgbagwoju anya.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close