NKE NA-EME UGBUA
ALA OZÍZÉ (LANDSLIDE) ERIBIDOWO IHE KARỊRỊ EZINỤLỌ IRI N’OWERE

Owere: Ihe karịrị ezinụlọ iri ka ala ÓZÍZÉ ribidoro n’okporo ụzọ Trinity nke dị n’Akwakụma n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Owere n’Imo Steeti.
Nkea mere ka oke mmiri zoro site n’abalị ụbọchị ụka were pụta ụtụtụ taa bụ Mọnde.
Ndị bi ebe ahụ rịọrọ Gọọmenti ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka iji zọpụta ha n’oke ihe ize ndụ ha nọ n’ime ya maka ya bụ ala ozízé.